Psalms 16:8-11

8Ana m elekwasị Onyenwe anyị anya mgbe niile.
Ebe ọ nọ nʼaka nri m, agaghị m ama jijiji.

9Nʼihi nke a, obi dị m ụtọ, ire m jupụtakwara nʼọṅụ;
aga m anọkwa nʼudo.
10Nʼihi na ị gaghị ahapụ m nʼala mmụọ,
ị gaghị ekwekwa ka Onye gị kwesiri ntụkwasị obi
Maọbụ, onye gị dị nsọ
hụ ire ure.
11I gosila m ụzọ ndụ;
ị ga-eji ọṅụ mejupụta obi m nʼihu gị;
ya na ihe ụtọ ndị dị nʼaka nri gị ruo ebighị ebi.
Copyright information for IboBIU